Gịnị mere a sị ụlọikpe ji nye iwu ka a nwụchie Owelle?

Ebe foto si, Rochas Okorocha/Hope Uzodimma/Facebook
Dịka akụkọ na-ekwu na Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abuja enyela iwu ka a nwụchie aka chịbụrụ Imo steeti bụ Rochas Okorocha, onye bụbu Senetọ mpaghara Okigwe bụ Ifeanyi Araraume na mmadụ anọ ndị ọzọ maka ebubo ịkpa nkata rụọ mpụtara akpụrakpụ nke ntuliaka imeụlọ otu APC, otu ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ n'Imo Steeti na-akpọ gharaghara.
Nke a na-abịa dịka ụlọọrụ na-ahazị ntuliaka na Nigeria bụ Independent National Electoral Commission (INEC) gwara ndị uweojii na ndị uweojii nzuzo Nigeria bụ Department of State Services (DSS) ka ha nyochaa Okorocha maka ebubo na ọ na-ebugharị asambodo mpụtara ntuliaka imeụlọ adigboroja nke otu APC.
End of Akụkọ ndị ọzọ yiri ya
Okorocha na-azọsara aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma na ọ bụ ya onwe ya bụ Okorocha meriri na ntuliaka imeụlọ APC maka ịnọchite mpaghara Imo-West n'Ụlọomeiwu-Ukwu nke Nigeria na Ntuliaka 2027.
Mana Inec na-ekwu na akwụkwọ APC nyere ha bụ nke gosiri na ọ bụ Hope Uzodimma meriri ma bụrụ onye ga-efere APC ọkọlotọ na ntuliaka na-abịa abịa maka ọkwa ịnọchite mpaghara ahụ.

Ebe foto si, Rochas Okorocha/Facebook
Mana Okorocha gọrọ sị na ụlọikpe enyeghị ụdị ntuziaka ahụ.
N'okwu ya site n'ọnụ na-ekwuru ya bụ Sam Onwuemeodo, Okorocha kwuru sị, "Anyị na-ekwu hoohaa, na o nweghị ụlọikpe, ma Majie, ma Ụlọikpe Ukwu nyere iwu ka a nwụchie Okorocha."
Ozi ahụ gara n'ihu maa onye ọbụla na-ekweghị ịbịa gbaghaa ya, site n'iwepụta akwụkwọ nnwuchi nke ụlọikpe.

Ebe foto si, Hope Uzodimma/Facebook
Cheta na Rochas Okorocha na-agbagha mpụtara ntuliaka imeụlọ APC maka onye ga-anọchite Imo-West, kwechiri na ọ bụ ya meriri.
Okorocha wepụrụ akwụkwọ n'Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abuja n'ụbọchị 13 Ọgọst 2026 na-achọ ka Ụlọikpe kagbuo aha Uzodimma ma tinye aha nke ya onwe ya.
Okorocha sịrị na ya ji vootu 150,780 merie Hope Uzodimma bụ onye ọ sịrị nwetara vootu 102,158 , na-agbanyeghị na otu APC wegaara Inec akwụkwọ nke kwuru na Hope Uzodimma ji vootu 230,464 merie Okorocha, bụ onye ha kwuru nwetara vootu 1,098.
Okorocha kwukwara na Uzodimma etozughị oke ịzọ ọkwa sịnetọ dịka ọ ka nọ n'oche dịka gọvanọ Imo steeti bụ nke a tụrụ anya ga-abịa n'isi njedebe n'ọnwa Jenụwarị 2028.
Oge BBC kpọrọ Ambrose Nwaogwugwu bụ onye enyemaka gọvanọ Imo Steeti n'ihe gbasara mgbasaozi n'ụzọ ọgbaraọhụrụ, i ji mara ebe Gọvanọ Hope Uzodimma kwụ n'okwu a, ọ sịrị na ya ga-azaghachi anyị ma e mesịa, mana o meghị nke a tupu e bipụta akụkọ a.
Kedụ etu okwu a ga-esi ebi? Ọ bụ ụlọikpe ka ọ bụ Inec ga-ekpebi ya? Ọ bụ ọdinihu ga-ekwu.


























